Skip Navigation
The Endowment for Human Development
The Endowment for Human Development
Improving lifelong health one pregnancy at a time.
Donate Now Get Free Videos

Multilingual Illustrated DVD [Tutorial]

The Biology of Prenatal Development




BAYỌLỌJI NKE MMALITE OTITO TUPU ỌMỤMỤ NWA

.Igbo


National Geographic Society This program is distributed in the U.S. and Canada by National Geographic and EHD. [learn more]

Choose Language:
Download English PDF  Download Spanish PDF  Download French PDF  What is PDF?
 

The Fetal Period (8 Weeks through Birth)

Chapter 37   9 Weeks: Swallows, Sighs, and Stretches

Oge nke fịtọs ga-aga n’ihu ruo n’oge ọmụmụ nwa.

N’izu itoolu, ịmi aka ebido nwa ebu n’afọ nwere ike ilo mmiri omụmụ.

nwa ebu n’afọ nwekwara ike ijide ihe aka, megharia isi ya ka ọ gaa ihu ma ọ bụ azụ, mepee ma mechikwaa agba ya, megharia ire ya, rie ude nakwa gbatia.

Irighiri akwara nọ n’ihu, nakwa nke nọ n’ọba aka, na makwa n’oba ụkwụ nwere ike ịmata mgbe emetụtara aka dị mfe.

"N’imeghari ahụ maka mmetụta dị mfe n’ọ ọba ụkwụ," nwa ebu n’afọ ga-ehulata ukwu ya na ikpere ya, o nwekwara ike rọkọlata mkpụrụ ụkwụ ya.

Ugbua eluanya emechichala nke ọma.

N’ime ekọ akpịrị, akwara nke eji ekwu okwu na-aputa n’egosipụta mmalite ntoputa nke ebe okwu si apụta.

N’ime ụmụaka ndi nke nwanyi, a ga amata nke bụ akpanwa ya, sel ọmụmụ akabeghị aka, nke ana-akpo ogonia, na-enwoghari n’ime akpaakwa nwa.

Ihe eji ama nke nwoke na nke nwanyi ebidole kewaputasiwa onwe ha dika nke nwoke ma ọ bụkwa nke nwanyị.

Chapter 38   10 Weeks: Rolls Eyes and Yawns, Fingernails & Fingerprints

Otito di egwu ana-enwe n’ime izu nke itoolu na nke iri na ebuli arụ nwa n’ihe kariri pasenti iri asaa na ise.

N’izu nke iri mmetuta nke nkuanya nke elu n’akpata igwodata anya ala.

nwa ebu n’afọ na-eghe ughere ma na-emepekwa na-emechi ọnụ ya kwa mgbe kwa mgbe.

Otụtụ ụmụaka ebu n’afọ na-ami isi aka nri ha.

Akụkụ eriri afọ nọ n’ime eriri nwa abiaghachiwa n’ime oghere dị n’ime afọ.

Osifikeshionụ [ya bụ mgbe ihe niile eji akpụ ọkpụkpụ na-abanye n’ebe digasị iche iche na emekwa ka ọkpụkpụ sie ike

Mbọ aka na mbo ụkwụ amalitela tobe.

Akara mkpụrụaka pụrụ iche na-aputa ihie n’izu iri site na njikọta spam nwoke na akwa nwanyi gasịrị. Akara a nwere ike ịbụ ihe iruba ama na ndụ n’ile mmadụ.

Chapter 39   11 Weeks: Absorbs Glucose and Water

N’izu iri na otu imi na egbugbere ọnụ etoputachaala nke ọma. Dika ọ di n’akụkụ ahụ ndị ọzọ, ọdịdi ha na-agbanwe n’ogo ọbụla nke mmadụ toruru na ndụ.

Eririafọ ebido mitawa glukos nakwa mmiri nke nwa ebu n’afọ loro.

N’agbanyeghi na ana-amata ma nwa ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyi na njiko spam nke nwoke na akwa nke nwanyi, ugbu a ihe nwoke na nwanyi ji enwe mmekọrita ke dị na mpụta aputachala nke ọma ugbua nke bụ na aga-amata ihe dị iche dị ka ọbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.

Chapter 40   3 to 4 Months (12 to 16 Weeks): Taste Buds, Jaw Motion, Rooting Reflex, Quickening

N’etiti izu iri na otu na izu iri na abụọ, arụ fitọs na-abawaye ruo ihe dị ka pasenti iri isii.

Izu iri na-abụọ n’egosi ngwucha ụzọ nke mbụ n’ime atọ, ma ọ bụ ụzọ atọ nke ekere n’ oge afọime.

Ihe nd eji anụ ụtọ ndị pụruụ iche biaziri ugbu a jupute n’ime ọnụ.
N’ oge ọmụmụ nwa, ihe ndi na-eme ka nwa nụọ ụtọ ka ga-anọkwa ya naani n’ire na n’okpo ọnụ.

Njaghari afọ na-amalite n’oge dị ka izu iri na abụọ ma gakwaa n’ihu ruo ihe dika izu isii.

Ihe mbụ nwa amụrụ ohụrụ n’anyụputa ka ana-akpọ mekoniọmụ. Emebere ya site n’ụmụ irighiri ihe na-agwa nri, ihe ndi na-edozi ahụ, nakwa sel ndị nwụrụ anwụ nke ihe na-agwa nri wụsasịrị.

N’izu iri na abụọ, ogologo aka a chọla iru etu otosịrị iru n’ogo nke ahụ mmadụ. ( ya bụ ogo ahụ nwa ahụ) Ụkwụ na-ewe ogologo oge n’igaru ogo etu otosịrị iru.

Ewezụga azụ na elu isi, ahụ nwa ebu n’afọ niile na-emegharị na mmetụta aka dị mfe.

Ndiiche na-adị na otito na-esite ma mmadụ abụ nwoke ma ọbụ nwanyị na aputa ihie mgbe nke izizi. Iji maa atụ, ụmụaka ebu n’afọ ndị nke nwanyi na-ezikoputa mmegharị nke agba ha ugboro ugboro karia ụmụ nwoke.

Ndiiche dị na mmegharị nke nlubiri ahụrụ na mgbe mbụ, mmetụta aka n’akụkụ ọnụ na-eme ka nwa tugharịa ebe ænye, ma ọbụ ihe, metutara ya aka nọ nakwa megharikwa ọnụ ya. Mmegharia ka ana-akpọ "rutin refleks" ọ na-adigidekwa ma amụchaa nwa, na-enyere nwa amụrụ ọhụrụ aka ịchọta ọnụ ara nne ya n’oge ana-enye ya ara.

Ihu nwa ana-aga n’ihu na-aka aka ka abuba na-amalite ijuputa nti nwa nakwa ka ntolite eze malitekwara.

N’izu iri na ise, sel na-akpụ ọbara abata na-amụba n’ime ụmị ọkpụkpụ. Imilikiti ọkpụkpụ sel na-ebubata ọbara ga-amalite ebe a.

N’agbanyeghi, na embrayo na-amalite immeghari ahụ n’izu isii, nwanyi dị ime na-enwetụta mmeghari ahụ izizi nke nwa ebu n’afọ n’etiti izu iri na anọ na izu iri na asatọ. N’odinaala, ihe dị otu a ka ana-akpọ kwikinin (ya bụ ịnụtụta mmegharị ahụ izizi fitọs).

Chapter 41   4 to 5 Months (16 to 20 Weeks): Stress Response, Vernix Caseosa, Circadian Rhythms

N’izu iri na isii usoro gunyere nfanye alanga n’ime afọ nke nwa ebu n’afọ na-akpalite homonụ malitere na mmeghari ahụ na gbapụtakwa nọradrenalini, ma ọ bụ nọrepinefrini, n’ime ọwa ọbara. Ụmụaka amụrụ ọhụrụ na ndi okenye na-enwe mmegharị ahụ yiri onwe ya n’ihe gbasara usoro ọbula na emekpa ha ahụ.

Na sistem okukuume, osisi nke ngụ fodụrụ ntakiri ka o zuo oke.

Otu ihe nchekwa dị ọcha, ana - akpọ “veniks kasiosa”, ga – ekpuchizi nwa ebu n’afọ ugbua. Veniks na – echekwa anu ahụ site n’ihe mgbakasi ahụ si na mmiri ọmụmụ.

Site n’izu iri na itoolu, mmeghari ahụ nwa ebu n’afọ,usoro ọkụkụ ume, na nnọdụ mkpụrụ obi ebido sowe eregede kwa ụbọchị nke ana - akpọ sikadian ridims (ya bụ etu eji emepụta homonụ na-eme ka ihe niile rụọ ọrụ ọfụma).

Chapter 42   5 to 6 Months (20 to 24 Weeks): Responds to Sound; Hair and Skin; Age of Viability

N’izu iri abụọ koklia, nke bụ ọgan eji anụ ihe, eruola ogo nke okenye n’ime otito zuru oke nke imerime nti. Site ugbu a gaa n’ihu, nwa ebu n’afọ ga-emeghari nyere ọtụtụ ụda dị iche iche.

Ntutu ga-ebido towe n’isi nwa.

Ngidingi na odidi anụ ahụ niile aputachaala, tinyere oghere gbara ukwu aji gburu gburu nakwa akụkụ ahụ mmadụ na-ewere imilikiti ihe n’ime mmee mmadụ dote ha ma ọbụ wepụ ha n’ahụ mmadụ

N’izu iri abuæ na otu ruo n’izu iri abuæ na abuæ mgbe njiko spam nwoke na akwa nwanyi ga chara, ngụ ga-enwetatụ ikikere iji iku ume. Nke a ka a na-ewe ka mgbe otito nwa nọ n’ime akpa nwa Ga ezurugor ya nke bụna onwere ike ibilite ndụ makana ịdị ndu na mputa akpanwa ga-enwe isi n’ebe ụfọdụ nwa ebu n’afọ nọ. Ọtụtụ iga n’ihu na nchọpụta nke ndi na-ahụ maka ahụ ike na-eme ka enwe ike ichekwa ndụ nke ụmụaka a mụrụ n’erughi oge ha tosiri iru tupu amụọ ha (ya bụ ụmụaka akachaghị aka).

Chapter 43   6 to 7 Months (24 to 28 Weeks): Blink-Startle; Pupils Respond to Light; Smell and Taste

N’izu iri abụọ na anọ, elu anya emepekwa ọzọ nwa ebu n’afọ na-eziko mmeghari ntabi anya nke n’eyi gi eyi. Mmeghari a n’ebe uda ike nọ na-etoputakari n’oge n’ebe nwa ebu n’afọ nke nwanyi nọ.

Ọtụtụ ndị nchọputa kowara na mkpughe n’ebe oke uda nọ nwere ike imetuta ahuike nke nwa ebu n’afọ. Nsogbu nwere ike ịpụta gunyere mgbati ubara nke ọnọdụ mkpụrụobi, nwa ebu n’afọ ilo ihe karia ka atụrụ anya ya na mgbawe agwa n’eyi eyi. Ụfọdụ nsogbu mwere ike idaputa ma emechaa gunyere na nwa agaghi anụzikwa ihe.

Okuku ume nwa ebu n’afọ nwere ike ịla elu nke ukwu ihe dika nkuru ume na nkụpụta ugboro iri anọ n’anọ dị n’otu nkeji.

N’oge ọnwa atọ nke ikpe azụ n’afọime, otito osisọ nke ụbụrụ na-eburu umele ihe kariri pasenti iri ise nwa ebu n’afọ kuuru. Arụ uburu na-abawanye ruo ihe dị ka pasentị narị anọ ma ọ bụ narị ise.

N’izu iri abụọ na isii mkpụrụ anya ebido gbapụtawa anya mmiri.

Ọdụanya na - emegharị n’oge ebe ihe dị n’ihe dị ka izu iri abụọ na asaa. Mmeghari a na – echekota oke ihe n’erute n’oduanya na ndụ niile onyeahụ.

Ihe niile a chọrọ iji nụ isi nke ọbụla amalitele rụwa ọrụ. Ọmụmụ gbasara ụmụaka akachaghị aka gbara ama ikikere iji chopụta isi n’oge dị ka izu iri abụọ na isii mgbe njiko spam nke nwoke na akwa nwanyi gachara.

Idote ihe dị ụtọ n’ime mmiri ọmụmụ na-ebulite ugboro ole nwa ebu n’afọ na-elo ihe. N’idi iche, e nwere mgbada n’usoro nwa ebu n’afọ si elo ihe sotere iwebata ihe na-elu ilu. Mgbanwe ozi dị n’iru kwa mgbe kwa mgbe na-esotekwa.

Site usoro ntụpụ ụkwụ yiri agam ije, nwa ebu n’afọ atugharịwa.

Nwa ebu n’afọ adighịzịkwa ka ọhikọrọ ahịko etu ọdị mbụ ka abụba ndị ọzọ na-apụta n’okpuru anụahụ. Abụba na arụ orụ di mkpa n’ikwagide udịdị ahụ na-edọbakwa umele mgbe amuchara nwa.

Chapter 44   7 to 8 Months (28 to 32 Weeks): Sound Discrimination, Behavioral States

N’izu iri abụọ na asaa nwa ebu n’afọ nwere ike imata ihe dị iche di n’uda dị elu na nke dị ala.

N’izu iri atọ, a na ahụkarị mmeghari iku ume ugbua ọ nakwa eziko site n’oge na pasentị iri ato ruo iri anọ n’ebe nwa ebu n’afọ nọ.

Mgbe oruru n’onwa anọ nke ikpeazụ n’afọ ime, nwa ebu n’afọ na-egosiputa usoro ọrụ ejikwatara nke ọma a nwekwa mgbe ezum ike. Usoro omume ndia n’egosiputa mbawanye ihe ga-ebute nsogbu nke sentral nevọs sistem.

Chapter 45   8 to 9 Months (32 to 36 Weeks): Alveoli Formation, Firm Grasp, Taste Preferences

Na nhatanha izu iri atọ na abụọ, ezigbo nkọlọ, ma ọ bụ sel akpa ume, amalite itolite na ngụgụ. Ha ga na-etolite tutu ruo afọ asatọ amụchara nwa.

N’izu iri atọ na ise nwa ebu n’afọ amarala ejidesi ihe aka ike.

Mkpughe nwa ebu n’afọ n’ebe ihe dị iche dị dika ọ na-emetụtụ ụdị ụtọ nwa n’achokarị ma amucha ya. Ima atụ, ụmụaka ebu n’afọ ndị nne ha riri anaisi, ihe na-enye likoraịsị ụtọ ya, gosiri nnabata anaisi mgbe amuchara ha. Ụmụaka amụrụ ohụrụ ndi eweghi mkpugbe mgbe ya nọ n’afọ kpọrọ anaisi asị.

Chapter 46   9 Months to Birth (36 Weeks through Birth)

Nwa ebu n’afọ na-amalite njem ime omume site n’inuputa homonụ nke ana-akpọ estrojin nke ukwu nke a na-amalite ntughari site na nwa ebu n’afọ buruzie nwa amụrụ ọhụrụ.

Ihe ejiri mara ime omume bụ mbili elu na mgbadata sirike nke akpanwa, nke ga-abụzị ọmụmụ nwa.

Site na njikọ spam nwoke na akwa nwanyi ruo n’ọmụmụ nwa ma ọ bụ karia oge ahụ, otito mmadụ na-agbanwe agbanwe na-agakwa n’ihu ma dikwa mgbagwojuanya. Ihe nchọpụta ohụụ gbasara usoro a togburu onwe ya. gosiri mmetụta dị mkpa na n’otito nwa ebu n’afọ na ahụike nke ndụ.

Dika nghota anyi n’ihe gbasara mmalite otito mmadụ na abawanye, otu a ka ikikere anyi ikwalite ahụike na-abawanyekwa ma mgbe adị ime ma mgbe amụrụ nwa.